IGHALI EGO ELU NA MMEMME: NDI EFCC EJIDEWO BOBRISKY
Legọs – Ụlọ ọrụ na-emegide ngarị bụ Economic and Financial Crimes Commission, EFCC, Ngalaba Legọs ekwuwo na ndị ọrụ ha ejidewo nwoke nwanyị bụ Idris Okuneye nke a maara dịka Bobrisky maka ighalị ego elu na mmemme.
EFCC nọrọ n’ozi o wepụtara n’ogige ọbaozi mmekọrịta Twitter (X) ha were kwuo na ha zigara ya bụ nwaamadị dị iri afọ atọ na otu ozi Akpọmoku ịbịa zara ọnụ ya maka ihe nkiri wusara ọbaozi nile nke gosiri ebe ọ na-aghali Naira ọhụrụ elu na mmemme ngosipụta mbụ nke éjìjé Yoruba aha ya bụ Ajakaju, nke Eniola Ajao mebere.
Mmemme ahụ bụ n’abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Maachị afọ a n’ụlọ ezumezu Film One Circle Mall, Lekki, Legọs.
EFCC na-ekwu na nchoputa ha gosiri na ya bụ nwaamadị ome ka nwaanyị dịbụ na mbụ bụrụ onye e jiri ịghali ego elu na mmemme were mara.
“Ka ụlọ ọrụ anyị (EFCC) zigara ya ozi Akpọmoku, ọ wuchiri isi ụlọ ọrụ anyị na mpaghara Legọs n’ụtụtụ Wenezdee, abalị anọ nke ọnwa Eprel afọ a, maka ịgba ajụjụ ọnụ nakwa ide edemede nzara ọnụ ya”
Ha kwukwara na-aga akpụpụ ya ụlọikpe ma ha mechaa nnyocha ha.
hmmm, nke a apụtara na Bobrisky bụ onye ajọ chi, mmiri na-àfá n’ézé? Ọ kwa ego nke mmadụ nile na-aghali elu? Ma Naira, ma Dọla. Ka ọ bụ na ọ dabara n’ọnya ndi iro.